32Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a.
33Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara.
34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya.
35Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”
36Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara.