2Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a.
3Gịnị mere Onyenwe anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?”
4Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”
5Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
6Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.