4Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.”
5Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ.
6Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.
7Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma.
8Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.