6Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha.
7Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma.
8Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.
9Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”
10Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile.