11Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?”
12Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.
13Ọ bụ na o zurughị gị na i si nʼala Ijipt ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru kpọpụta anyị igbuchapụ anyị nʼọzara a? Ugbu a ị chọkwara ime onwe gị onyenwe anyị?
14Nke kachasị nke, ị kpọbatabeghị anyị nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. I nyebeghị anyị ihe nketa ala ubi na ubi vaịnị. Ị chọrọ ịghụpụsị ndị ikom ndị a mkpụrụ anya? Anyị agaghị abịa!”
15Mgbe ahụ, oke iwe were Mosis. Ọ kpọkuru Onyenwe anyị sị ya, “Anabatakwala aja ha niile! Ọ dịbeghị oge m naara ha ihe ọbụla, ọbụladị otu ịnyịnya ibu! O nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha m mejọrọ.”