Ọnụọgụgụ 16

Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,

Numbers 16:39 (UKJV) And Eleazar the priest took the brazen censers, wherewith they that were burnt had offered; and they were made broad plates for a covering of the altar:

37“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.

38Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”

39Ya mere Elieza, onye nchụaja, chịkọtara ihe ịgụ ọkụ bronz ndị ahụ nke ndị ahụ a kpọrọ ọkụ wetara, tipịa ha, mee ka ha ghọọ ihe sara mbara e ji ekpuchi ebe ịchụ aja,

40dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu site nʼọnụ Mosis. Ka ọ bụrụ ihe ncheta nye ndị Izrel niile na onye mba ọzọ a na-enyeghị ike, nke na-esiteghị nʼagbụrụ Erọn, ekwesighị ịbịaru Onyenwe anyị nso isure aja nsure ọkụ nye ya, ka ihe mere Kora na ndị sonyere ya ghara ime ha.

41Ma nʼụtụtụ echi ya, nzukọ Izrel niile malitere itamu ntamu megide Mosis na Erọn sị, “Unu egbuchaala ndị nke Onyenwe anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.