44Ma Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
45“Sinụ nʼetiti ọgbakọ a pụọ ka m bibie ha nʼotu ntabi anya.” Ha dara kpuo ihu nʼala.
46Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”
47Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.
48O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.