Ọnụọgụgụ 16

O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.

Numbers 16:48 (UKJV) And he stood between the dead and the living; and the plague was stayed.

46Mgbe ahụ, Mosis sịrị Erọn, “Ngwa, were ihe ịgụ ọkụ ma site nʼebe ịchụ aja gụnye ya ọkụ. Tinye ya ụda na-esi isi ụtọ. Burukwa ya gaa ngwangwa nʼetiti nzukọ Izrel ka i kpuchiere ha mmehie ha, nʼihi na iwe ọkụ Onyenwe anyị adakwasịla ha. Nrịa nrịa na-efe efe amalitekwalarị ibibi ha.”

47Erọn mere dịka Mosis kwuru. O mere ngwangwa gbaba nʼetiti ndị Izrel nʼihi na nrịa nrịa ahụ ebidola nʼezie ịdakwasị ha. Erọn mụnyere ụda na-esi isi ụtọ ahụ ọkụ, si otu ahụ kpuchiere ha mmehie ha niile.

48O guzokwara nʼetiti ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ tutu ihe otiti ahụ akwụsị.

49Ma ihe otiti ahụ egbuolarị puku mmadụ iri, puku anọ na narị asaa (14,700). A gụnyeghị ndị niile ahụ so Kora nwụọ nʼụbọchị gara aga.

50Mgbe ahụ, Erọn laghachikwutere Mosis nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ, nʼihi na nrịa nrịa ahụ na-efe efe akwụsịla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.