5Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
6Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
7mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”
8Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị!
9Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi?