3Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”
4Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.
5Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.
6Lee ihe ị ga-eme, Echi gị onwe gị Kora, na ndị niile nọnyeere gị, chịrịnụ ihe ịgụ ọkụ,
7mụnye ha ọkụ. Tinyekwanụ ụda na-esi isi ụtọ nʼime ha, were ha bịa nʼihu Onyenwe anyị. Onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara ga-abụ onye ahụ dị nsọ. O zuorola unu, unu ụmụ Livayị!”