Ọnụọgụgụ 16

Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”

Numbers 16:3 (UKJV) And they gathered themselves together against Moses and against Aaron, and said unto them, All of you take too much upon you, seeing all the congregation are holy, every one of them, and the LORD is among them: wherefore then lift all of you up yourselves above the congregation of the LORD?

1Ugbu a, Kora nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livayị, na ụfọdụ ndị agbụrụ Ruben bụ Datan, na Abiram ụmụ Eliab, na On, nwa Pelet nupuru isi

2bilie imegide Mosis. Ndị so ha bụ narị ndị ikom abụọ na iri ise, ndị ndu a maara nke ọma, ndị so nọdụ nʼụlọ nzukọ ukwuu ndị Izrel.

3Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. Onyenwe anyị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ Onyenwe anyị?”

4Mgbe Mosis nụrụ ihe ndị a ha kwuru, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala.

5Mgbe ahụ, ọ gwara Kora na ndị niile sonyeere ya, sị, “Nʼụtụtụ echi, Onyenwe anyị ga-eme ka amara ndị bụ ndị ya na onye dị nsọ. Ọ ga-eme ka onye ahụ bịaruo ya nso. Onye ọ ga-ahọpụta ka ọ ga-emekwa ka ọ bịaruo ya nso.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.