Ọnụọgụgụ 18

Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja.

Numbers 18:1 (UKJV) And the LORD said unto Aaron, You and your sons and your father's house with you shall bear the iniquity of the sanctuary: and you and your sons with you shall bear the iniquity of your priesthood.

1Onyenwe anyị gwara Erọn sị, “Gị, na ụmụ gị ndị ikom gị, na ezinaụlọ nna gị ga-ebu ahụhụ ajọ omume metụtara ebe nsọ ahụ. Gị na ụmụ gị ndị ikom naanị ka ọ dị nʼaka ịsa ajụjụ ihe ọjọọ ọbụla banyere ọrụ nchụaja.

2Site nʼebo unu kpọbata ụmụnna gị ndị Livayị ka ha sonyere gị ma nyere gị aka mgbe gị na ụmụ gị ndị ikom na-eje ozi nʼụlọ nzute Ihe Ama.

3Ha ga-anọ gị nʼokpuru ije ozi niile nʼụlọ nzute, ma ha agaghị abịaru nso ngwongwo e ji chọọ ebe nsọ ahụ mma, maọbụ nʼebe ịchụ aja. Ma ọ bụghị otu a, gị na ha ga-anwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.