Ọnụọgụgụ 18

“Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị.

Numbers 18:14 (UKJV) Every thing devoted in Israel shall be yours.

12“Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị.

13Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya.

14“Ihe niile e doro nsọ nʼala Izrel niile nye Onyenwe anyị bụ nke gị.

15Ihe niile e bụ ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụ ụlọ, nke e nyere Onyenwe anyị dịka onyinye, bụ nke gị. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ, na ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ ndị na-adịghị ọcha.

16Mgbe ha dị otu ọnwa, a ga-eji shekel ọlaọcha ise, nʼusoro shekel ebe nsọ, nke bụ iri ihe ọtụtụ gera abụọ gbapụta ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.