22Site ugbu a gaa nʼihu, o nweghị onye Izrel ọbụla kwesiri ịbịa nso ụlọ nzute ahụ, ka ha ghara iwetara onwe ha ikpe ọmụma, mmehie na ọnwụ.
23Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel.
24Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
25Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị,
26“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.