24Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ”
25Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị,
26“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
27A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.
28Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.