29Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’
30“Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta.
31Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.
32Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”