5“Gị ka ọ dịrị ilekọta ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ, na ebe ịchụ aja ahụ, ka oke iwe Onyenwe anyị ghara ịdakwasị onye ọbụla nʼala Izrel ọzọ.
6Mụ onwe m ahọpụtala ụmụnna gị ndị Livayị site nʼetiti ndị Izrel, were ha nye gị dịka onyinye, ka ha bụrụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị maka ịrụ ọrụ ụlọ nzute.
7Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.”
8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.
9Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.