19Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha.
20Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
21Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.
22Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”