11Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.
12Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.
13Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.
14Nʼihi nke a, nʼAkwụkwọ Agha dị iche iche nke Onyenwe anyị na-asị, “Waheb nʼime Sufa ya na ndagwurugwu niile Anọn
15na mgbadata ndagwurugwu ndị ahụ nke gbasapụrụ ruo nʼebe Ar dị, nke tọgbọrọ nʼoke ala Moab.”