Ọnụọgụgụ 21

Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.

Numbers 21:11 (UKJV) And they journeyed from Oboth, and pitched at Ijeabarim, in the wilderness which is before Moab, toward the sunrising.

9Ya mere, Mosis ji bronz kpụta agwọ yiri otu nʼime agwọ ndị ahụ, tinye ya nʼọnụ osisi dị ogologo. Onye ọbụla kwa agwọ ahụ tara nke welitere anya ya elu lee agwọ bronz ahụ anya, dịkwara ndụ.

10Ụmụ Izrel biliri njem, manye ụlọ ikwu ha na Obot.

11Ha sikwa nʼObot bilie njem, maa ụlọ ikwu ha na Iye Abarim, nʼọzara ahụ nke chere ihu nʼobodo Moab, nʼụzọ ọwụwa anyanwụ.

12Ha si nʼebe ahụ bilie njem, manye ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Zered.

13Ha sitekwara nʼebe ahụ bilie njem, maa ụlọ ikwu ha nʼofe iyi Anọn nke dị nʼọzara ruru nʼoke ala ndị Amọrait. Iyi Anọn bụ oke ala Moab, nʼetiti ndị Moab na ndị Amọrait.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.