Ọnụọgụgụ 21

“Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.

Numbers 21:28 (UKJV) For there is a fire gone out of Heshbon, a flame from the city of Sihon: it has consumed Ar of Moab, and the lords of the high places of Arnon.

26Heshbọn bụ isi obodo Saịhọn, eze ndị Amọrait onye busoro eze naara achị Moab agha dọta ala ya niile nʼagha ruo Anọn.

27Ọ bụ nke a mere ndị na-arọ abụ ji kwuo sị, “Bịa na Heshbọn ka e wukwaa ya, ka e mee ka isi obodo eze Saịhọn guzosie ike.

28“Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn pụọ. Ire ọkụ esitela nʼobodo ukwu Saịhọn, rechapụ obodo Ar, nke dị na Moab, ndị nwe ebe niile dị elu nke Anọn.

29Ahụhụ dịrị gị Moab! Ndị a lara nʼiyi ka unu bụ, unu ndị Kemosh. Ụmụ ya ndị ikom aghọọla ndị na-enweghị ebe obibi. A dọtala ụmụ ndị inyom nʼagha, nye Saịhọn eze ndị Amọrait.

30“Ma anyị ebibiela ha, bibie Heshbọn ruo rịị na Dibọn, bibie ha ruo Nofa, ruokwa rịị Medeba.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.