18Ma Belam zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na Balak enye m ụlọeze ya nke juputara nʼọlaọcha na ọlaedo, apụghị m ime ihe ọbụla dị ukwuu maọbụ nke nta ịgabiga iwu Onyenwe anyị bụ Chineke m.
19Ma otu ọ dị, nọọnụ ka chị bọọ dịka ndị ọzọ ahụ mere ka m nwee ike chọpụta ma ọ dị ihe Onyenwe anyị ga-atụkwasị nʼihe o kwuru na mbụ.”
20Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”
21Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa.
22Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.