14Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
15Belam sịrị Balak, “Guzoro nʼebe a nʼakụkụ ihe aja gị, ebe mụ onwe m ga-ezute ya nʼofe nke ọzọ.”
16Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.”
17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?”
18Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.