Ọnụọgụgụ 23

Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!

Numbers 23:20 (UKJV) Behold, I have received commandment to bless: and he has blessed; and I cannot reverse it.

18Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.

19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?

20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!

21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.

22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.