20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.
22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha. Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel. Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”