Ọnụọgụgụ 24

A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.

Numbers 24:18 (UKJV) And Edom shall be a possession, Seir also shall be a possession for his enemies; and Israel shall do valiantly.

16amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe.

17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.

18A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.

19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”

20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.