17“Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ikom Shet niile.
18A ga-emeri Edọm, Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike.
19Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.”
20Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: “Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, ma ikpeazụ ya bụ mbibi!”
21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!