Ọnụọgụgụ 24

Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?

Numbers 24:23 (UKJV) And he took up his parable, and said, Alas, who shall live when God does this!

21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike, akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ!

22Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.”

23Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?

24Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”

25Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.