19Ụmụ ndị ikom Juda abụọ, Ịa na Onan, nwụrụ nʼala Kenan.
20Ma ụmụ ụmụ Juda ndị ọzọ, dịka ikwu ha dị iche iche si dị bụ ndị a: ikwu Shela, site na Shela, ikwu Perez, site na Perez, ikwu Zera, site na Zera.
21Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
22Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500).
23Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua