21Ikwu abụọ ọzọ si nʼagbụrụ Perez bụ ndị a: Ikwu Hezrọn, site na Hezrọn, Ikwu Hamul, site na Hamul.
22Ndị a bụ agbụrụ Juda. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku asaa, puku isii na narị ise (76,500).
23Ụmụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ikwu Tola, site na Tola, ikwu Pua, site na Pua
24ikwu Jashub, site na Jashub, ikwu Shịmrọn, site na Shịmrọn.
25Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300).