25Ndị a bụ agbụrụ Isaka. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii, puku anọ na narị atọ (64,300).
26Ụmụ ụmụ Zebụlọn dịka ikwu ha si dị bụ ndị a: ndị Sered, site nʼikwu Sered, ndị Elọn, site nʼikwu Elọn, ndị Jaliil, site nʼikwu Jaliil.
27Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500).
28Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
29Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.