27Ndị a bụ agbụrụ Zebụlọn. Ndị a gụrụ ọnụ dị iri puku isii na narị ise (60,500).
28Ụmụ ụmụ Josef dịka ha si dị nʼagbụrụ Manase na Ifrem bụ ndị a:
29Ụmụ ụmụ Manase bụ ndị a: ndị Makia, site nʼikwu Makia. Makia bụ nna Gilead. Ikwu Gilead, site na Gilead.
30Ndị a bụ ụmụ ụmụ Gilead: ikwu Leza, site na Leza, ikwu Helek, site na Helek.
31Ikwu Asriel, site na Asriel. Ikwu Shekem, site na Shekem.