Ọnụọgụgụ 26

“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:

Numbers 26:4 (UKJV) Take the sum of the people, from twenty years old and upward; as the LORD commanded Moses and the children of Israel, which went forth out of the land of Egypt.

2“Gaanụ gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ nzukọ niile nke ụmụ Izrel dịka ezinaụlọ ha si dị; ndị niile gbara iri afọ abụọ gafee. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị nwere ike ije agha.”

3Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,

4“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:

5Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,

6site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.