3Ya mere, na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ka Mosis na Elieza onye nchụaja nọ gwa ha okwu sị ha,
4“Gụọnụ ndị ikom gbara iri afọ abụọ gafee ọnụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.” Ndị a bụ ndị Izrel si Ijipt pụta:
5Ụmụ ụmụ Ruben, ọkpara Izrel, bụ ndị a: site na Hanok, ikwu Hanok, site na Palu, ikwu Palu,
6site na Hezrọn, ikwu Hezrọn site na Kami, ikwu Kami
7Ndị a bụ agbụrụ Ruben. Ọnụọgụgụ ha dị iri puku anọ, puku atọ na narị asaa na iri atọ (43,730).