14Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15Mosis zara Onyenwe anyị sị ya,
16“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
17Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.