16“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a.
17Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị.
19Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.
20Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.