1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2“Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’
3Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
4Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi.