Ọnụọgụgụ 29

Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.

Numbers 29:11 (UKJV) One kid of the goats for a sin offering; beside the sin offering of atonement, and the continual burnt offering, and the food offering of it, and their drink offerings.

9Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,

10jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.

11Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.

12“ ‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu Onyenwe anyị.

13Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu Onyenwe anyị nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.