Ọnụọgụgụ 29

Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,

Numbers 29:9 (UKJV) And their food offering shall be of flour mingled with oil, three tenth deals to a bullock, and two tenth deals to one ram,

7“ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.

8Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a.

9Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule,

10jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla.

11Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.