9Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
10Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
11Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.
12Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.
13Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.