7Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.
8Nʼime ndị ha gburu nʼagha ahụ bụ ndị eze Midia ise a na-akpọ Evi, Rekem, Zua, Hua na Reba. Ha jikwa mma agha gbuo Belam nwa Beoa.
9Ndị agha Izrel chịkọtara ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile nọ nʼala Midia dịka ndị ha dọtara nʼagha. Ha chịkọtara ngwongwo niile ndị Midia ji biri, tinyere igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ ha niile, dịka ihe ha dọtara nʼagha.
10Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.
11Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.