Ọnụọgụgụ 31

Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.

Numbers 31:12 (UKJV) And they brought the captives, and the prey, and the spoil, unto Moses, and Eleazar the priest, and unto the congregation of the children of Israel, unto the camp at the plains of Moab, which are by Jordan near Jericho.

10Emesịa, ha mụnyere ọkụ nʼobodo ndị Midia niile na ebe ha mara ụlọ ikwu, rechapụ ha nʼọkụ.

11Ha chịkọtara ihe niile ha dọtara nʼagha, ma mmadụ ma anụ ụlọ.

12Ndị a niile ha dọtara nʼagha na ngwongwo niile ha lụtara nʼagha ka ha buteere Mosis, na Elieza onye nchụaja na ọgbakọ Izrel niile na mbara ala Moab, nʼakụkụ osimiri Jọdan na ncherita ihu Jeriko.

13Mosis na Elieza onye nchụaja na ndị ndu ọgbakọ Izrel niile pụrụ gaa zute ha nʼazụ ebe ha mara ụlọ ikwu ha.

14Ma Mosis were iwe megide ndịisi agha, ya bụ ndị ahụ na-achị imerime puku ndị agha, na ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị si ibu agha lọta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.