Ọnụọgụgụ 31

Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”

Numbers 31:24 (UKJV) And all of you shall wash your clothes on the seventh day, and all of you shall be clean, and afterward all of you shall come into the camp.

22Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu,

23na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.

24Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”

25Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,

26“Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.