24Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.”
25Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
26“Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
27Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
28Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.