25Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
26“Gị na Elieza onye nchụaja, na ndịisi ezinaụlọ nke ọgbakọ Izrel niile, ga-agụkọ ihe niile unu dọtara nʼagha chọpụta ọnụọgụgụ mmadụ na anụmanụ.
27Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.
28Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.
29Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.