Ọnụọgụgụ 31

Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.

Numbers 31:29 (UKJV) Take it of their half, and give it unto Eleazar the priest, for an heave offering of the LORD.

27Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.

28Ma Onyenwe anyị nwere oke site nʼoke ndị ahụ jere agha: mmadụ, na ehi niile, na ịnyịnya ibu niile, na atụrụ na ewu niile. Oke Onyenwe anyị bụ otu ụzọ nʼime narị ise ọbụla.

29Nye Elieza onye nchụaja oke sitere nʼaja a dịka ihe Onyenwe anyị ketara.

30Otu aka ahụ kwa, site nʼoke ndị Izrel ga-eketa, kee ụtụ. Otu ụzọ nʼime iri ise, maọbụ mmadụ, maọbụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, maọbụ igwe anụ ụlọ ụzọ. Were ha nye ndị Livayị, ndị ọ dị nʼaka ilekọta ụlọ nzute Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ oke nke ha.”

31Ya mere, Mosis na Elieza onye nchụaja mere dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.