1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
2“Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.”
3Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.
4Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”
5Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.