Ọnụọgụgụ 31

Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.

Numbers 31:5 (UKJV) So there were delivered out of the thousands of Israel, a thousand of every tribe, twelve thousand armed for war.

3Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.

4Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.”

5Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.

6Mosis zipụrụ ha ibu agha, otu puku, otu puku site nʼebo ọbụla. Finehaz nwa Elieza, onye nchụaja, du ha gaa agha ahụ. O bu ngwongwo si nʼebe nsọ, tinyere opi ike nke a ga-afụ.

7Ha busoro ndị Midia agha dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Ha gburu onye ọbụla bụ nwoke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.