32Ihe nweta bụ nke fọdụrụ nʼihe ndị agha lụtara nʼagha bụ ndị a, bụ atụrụ dị narị puku isii, iri puku asaa na puku ise (675,000),
33Ehi dị iri puku asaa na puku abụọ (72,000),
34ịnyịnya ibu dị iri puku isii na otu puku (61,000),
35Ụmụ agbọghọ na-amatabeghị nwoke dị iri puku atọ na puku abụọ (32,000).
36Ya mere, ọkara e nyere ndị gara lụọ agha dị: Igwe ewu na atụrụ dị narị puku atọ na iri puku atọ na puku asaa na narị ise (337,500).