Ọnụọgụgụ 32

Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.

Numbers 32:20 (UKJV) And Moses said unto them, If all of you will do this thing, if all of you will go armed before the LORD to war,

18Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya.

19Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”

20Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu Onyenwe anyị, ibu agha.

21Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,

22mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.